Enyemaka ndị ụwa na-tụ n'ọnụ

Ụlọ ndị ụwa na-atụ n'ọnụ n'ala anyị bụ naịjiria karịrị akarị. Na-agbanyeghị na mkpa ha dị ntakịrị, o nweghị onye na elenyere ha anya ma ọ bụ jụọ ma ha hụkwara nri rie.

Gọmenti na ndị obodo leghaara ndị a ụwa na-atụ n'ọnụ anya, ma chezọ na ha chọrọ enyemaka ka ha wee hapụ ịnọ n'okporo ụzọ na-arịọ ego ha ga-eji rie ọ bụrụgodị otu ugboro nri n’ụbọchị.

Dịka nzukọ enyemaka na ndị nwere afọ ọma pụrụ iche, ka ndị Igbo Community union S/W Germany e.V jiri horo ntutu taa na ha agaghị ahapụ ndị a ka agụrụ gbuo ha. Anyị weere inyere ndị ụwa na-atụ n'ọnụ aka dịka otu ọkpụrụkpụ atụmatụ anyị ga na-akwado kwa afọ ọ bụla.

Ọ bụrụ na i nwere mmasị iso kwado anyị ka atụmatụ ọpụrụ-iche nke a na-aga n*ihu, biko kpọtụrụ anyị, anyị ga-asị gị ndewo!