Odenigbo Freiburg

Ndị egwu anyị bụ Odenigbo Freiburg na-egosịpụta ihe e jiri mara ndị Igbo. Ndị Igbo anaghị emekata omenala hapụ igba egwu maka na atụrụ si na e bụrụ egwu bata n'ama nna ya, ya amaghị agba, ya awuliwe elu. Ihe na-akpalite mmụọ igba egwu ndị Igbo karịrị akarị dịka ọja, ekwe, ogene, ubom, ịgba, opi dgz. Ya mere na ikoro anyị na-ada, onye ọja na-egbu, ọ bụrụ na ị maghị agba ị wụba ya ka mgbada.

Onye Igbo ibido gbawa egwu bụ ma a mụkwara ya amụ maka na ndị nne anyị bụ egwu ka ha ji azụ nwata.

Egwu ka e ji aragudo nwatakịrị ka ọ rahụ ụra, were na arafukwa nwata na-ebe akwa, ịmaatụ, "onye mụrụ nwa na-ebe akwa, égbé mụrụ nwa na-ebe akwa. Weta ụzịza dgz." Ka ha na-agụ ka ha na-awụ gị egwu, ma ị chọrọ ma ị chọghị, ị ga na-agba ya wee ruo n'ike agwụ gị. Nke a kpatara na taata, ọ bụrụ na anyị nụ ekwe, ogene ma ọ bụ ọja, ọ na-eme anyị sọ egwu egwu nke bụ na anyị agbapụghị ya ọ dị anyị ka onye a wọrọ nnukwu ihe. Onye Igbo nụrụ egwu ghara ịgba ya, mara na ụkwụ na-egbu ya mgbu ma ọ bụ na ahụ adịghị ya maka na egwu bụ otu ọkpụrụkpụ ihe ndị Igbo ji enwe obi añụrị.

Ndị egwu Igbo Community union s/w Germany e.V enweghị otu ụdịrị egwu ha na-akụ, n'ihi na anyị nwere ebu nwee mfụ, ihe anyị na-eti n'egwu bụ onye amaghị agba o kwewe n'isi. Ọ gbara Igbo gharịị dị n'egwu anyị wee bụrụ na onye ọ bụla gbarachaa ka o siri sọ ya, n'ikpeazụ ọ dakọkwaa ọnụ, aka a na-ada ebe nile.

Dịka anyị siri kọwaa na mbụ maka enyemaka anyị na-enyere ndị ụwa na-atụ n'ọnụ na naịjiria, anyị na-anara obere ego ma a kpọọ anyị oku ebe ọ bụla, iji na-enye aka ịkwado atụmatụ a. Nwa obere ihe ọ bụla anyị nwetara na ya bụ oku na-abakwa n'akpa maka atụmatụ enyemaka anyị. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata ihe anyị ji ewu ewu na jamani, kpọọ anyị oku maka na onye amaghị mmadụ na-asị ya onye ka ọ bụ. Ebe ọ bụla anyị lere ndị mmadụ ọbịa na-adị egwu maka na mmọnwụ anyị abụghị mmọnwụ nwanyị, Ndị egwu Igbo Community union s/w Germany e.V anaghịkwa eti mmọnwụ a na-akwa aka n'azụ maka na ọ na-abụ ahụ ézè, a hụ ngwa agha ya.

Anyị gbacha lawa, akụkọ a na-akọ. Soro mee ndị ọbịa gị obi ụtọ. Kpọtụrụ anyị!