Women Wing

with Husbands
       and Brothers

We Travel

Göttingen
Exhibiting Odenigbo

End of 2019

We are who we are
ONE LOVE

Odenigbo

We Celebrate
Our Cultural Heritage

Executive arm

Leaders of yesterday and
              Leaders of yesterday

Nkọwa Onwe

Ndị Igbo kwere na isi nwa egbe anaghị atọ na mba nke pụtara na ọ bụụrụ nwáfọ́ Igbo ọ bụla nnukwu ugwu ili ya na mbaraezi ya ma ọ bụ mbaraezi nna ya. Rukwaa taata, ndị Igbo ka na-eme omenala ịhụ na isi nwáfọ́ ruru ụlọ dịka o siri dị n'akwụkwọ nsọ agbaochie ya na n'omenala ndị Juu.

Ọ bụ ihe mere ede o jiri bee nwụrịm n'ọkwa, maka na ọ bụ site na nnukwu ọdachi dara na Freiburg na afọ 2001 ka ndị Igbo niile bi na gburugburu Freiburg jiri bido nzukọ nke a na-akpọ Igbo Community Union Southwest Germany e.V. Ọ bụụrụ ndị Igbo niile ihe mwute pụrụ iche n'afọ a mgbe otu nwáfọ́ a na-akpọ George Onwụ hapụrụ ha gaa zuru ike na ndokwa. Ozugbo ọdachi a dara ka ndị Igbo nọ nso kụrụ ekwe wee kpọkọọ ndị Igbo niile bi na gburugburu Freiburg ka ha bịa bakọọ isi ọnụ mara ka a ga-esi kwụọ nwanyị ukwu wara. Ndị Igbo karịrị mmadụ iri isii n'ọnụgụgụ zara oku ahụ. Dịka ndị Igbo si eme ihe ha, ha tụtara ukwu ego n'atufughị oge e jiri bulaa nwanne ha nwoke ahụ obodo ya bụ Ufuma, nke dị n'Anambra Steeti n'ihi na ọ bụ aka weta aka weta ka akpa ji eju.

Ndị Igbo ejighị ihe gbasara onwụ egwuri egwu n'ihi na o nweghị onye ma onye ọ ga-abụ echi. Ọ bụ na nzukọ izizi ahụ ka ndị Igbo nọrọ kpebie sị na ebe igwe mmadụ ha otu ahụ bi na gburugburu Freiburg, na nzukọ Igbo ga-esi ebe ahụ malite. Site n'ụbọchị ahụ ka ndị Igbo niile bi na gburugburu Freiburg jiri nọkọọ ọnụ dịka ụmụnne ma bụrụkwa akwaakwụrụ ruo taata. Ndị Igbo niile bịara nzukọ ahụ kwekọrịtara na ha ga-eji otu obi na-eme ihe ha ma na-elekọtakwa onwe ha anya dịka ụmụnne.

Bido ụbọchị ahụ e wubere nzukọ a ka ha nọ kwekọrịta na o nweghị onye ga-eleghara onye Igbo ibe ya anya na-agbanyeghị ụdị nsogbu ọ bụla dapụtaara ya (ma o zie ezie). Anyị bidoro ubọchị ahụ zawa 'onye aghala nwanne ya'.