Women Wing

with Husbands
       and Brothers

We Travel

Göttingen
Exhibiting Odenigbo

End of 2019

We are who we are
ONE LOVE

Odenigbo

We Celebrate
Our Cultural Heritage

Executive arm

Leaders of yesterday and
              Leaders of yesterday

Ịmụ asụsụ Igbo

Ikuziri ụmụ anyị Igbo bụ otu n'ime atụmatụ ndị Igbo community Union S/W Germany e.V malitere n'afọ 2007 oge Mazị Oscar Alison Aliukwu bụ onye isi oche nzukọ a. Ebumnuche e jiri malite ya bụ ka ụmụ anyị site ebe ahụ mụta ịsụ na ide asụsụ Igbo nke ọma, sikwa ebe ahụ mee ka ha mara n'agbụrụ ha bụ Igbo nwere ọtụtụ ezigbo omenala kwesịrị mmụta na nñomi. Ha ga-esi ebe ahụ marakwa n'ihe Igbo bụ onye aghala nwanne ya ka ọ bụ.

Nkuzi anyị bidoro kpọmkwem na abalị iri abụọ na ọnwa ọktoba 2007. Anyị kewara ụmụ akwụkwọ anyị ụzọ abụọ nke otu uzọ bụ ụmụ ntaakara, nke ọzọ bụrụ ndị praịmarị. Anyị mere ya otu a n'ihi na ndị zara oku ahụ anyị kpọrọ dị imirikiti, nwekwaa mmụta n'ụdị dị iche iche. Ndị ntaakara bụ bido n'afọ atọ wee ruo afọ isii, ma ndị praịmarị bụrụ bido n'afọ asaa wee gbagowe. Onye hụrụ ka anyị siri bido obere ụlọakwụkwọ a bịa ebe ahụ taata, ọ ga-ahụ na oke ihe emeela kamgbe ahụ maka na ọtụtụ n'ime ụmụntakịrị a na-asụzi ma na-edekwa asụsụ Igbo nke ọma.

Anyị na-anabata onye ọ bụla nwere mmasị ịmụta asụsụ Igbo, ma ụmụntakarị ma ndị okenye. Anyị na-enwe ihe ọmụmụ ụbọchị satọdee ọ bụla bido na elekere iri na abụọ nke ehihe wee ruo elekere abụọ nke ehihie na EBW Freiburg. Bịa soro mụta asụsụ Igbo nke ọma maka na taa bụ gboo.

Anyị agaghị echezọ imetụ aka na mbọ Lọlọ Eboson na Lọlọ Oguejiofor gbara ịhụ na anyị bidoro ya bụ ụlọakwụkwọ dịka ndị nkuzi izizi ụmụaka anyị nwere.

Ọ bụ maka mmụta, ịdịnaotu na ọganihu. O nweghị onye ọ na-asọ nsọ.