Birikwa

members

Igbo Community union S/W Gernamy e.V bụ ọgbakọ na nzukọ ndị Igbo niile bi na gburugburu Freiburg. E jiri ọnụọgụgụ 3650 denye aha anyị dịka nzukọ enyemaka n'akwụkwọ iwu ụlọ ikpe ndị Freiburg. Ebumnuche anyị bụ ka udo na-adị n'etiti ndị Igbo, ndị Jaman na ndị agbataobi anyị ndị ọzọ anyị na ha bi. Anyị na-akwalite omenala ndị Igbo n'ụdị pụrụ iche iji na-egosipụta ezigbo ihe gbasara agbụrụ na mba anyị siri pụta n'ihi na ọ bụ a na-ekiri ugo, a na-ekirikwa osisi o beere na ya. Anyị na-eme ihe e jiri mara ndị Igbo, egwu na amụ, were ya na-eme onwe anyị na ndị agbataobi anyị obi ụtọ site na i na-egosị ha ọkaramara dị n'egwu anyị.

Egbe bere ugo bere nke sị ibe ya ebela nku kwa ya! Ya gazie!!